Tinubu ọ̀ jụ̀rụ̀ ị́bànyè nà ńkwékọ́rị́tá ùdó 2023 dị́kà Kukah kwùrù?

Share this post:

Matthew Kukah, Bishop ụlọ ụka Katọlik nke diocezi Sokoto, ekwuola na onye isi ala Bola Tinubu abanyeghị na nkwekọrịta udo n’oge ntuliaka onye isi ala nke afọ 2023.

Kukah kwuru nke a na Sọnde, n’oge nzukọ nchekwa nke ntuliaka Edo steeti na Benin.

“Ihe ọzọ gbara m gharị bụ na onye bụ onye isi ala ugbu a, mgbe ọ na-azọ ọkwa onye isi ala, abanyeghị na nkwekọrịta udo. Osighị anyị n’aka na òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ọzọ ejighị ya megide ya oge ahụ,” Bishop a kwuru.

Nkwupụta Bishop Katọlik a enwetala ọtụtụ ntụnye ọnụ, ébé ụfọdụ ndị Naijiria na-ajụ ajụjụ banyere ntụkwasị obi nkwupụta a.

ḾBÌÀNYÉ ÁKÁ ÙDÓ NÀ NAIJIRIA

N’ihi ọtụtụ ihe mere tupu eme ntuliaka nke afọ 2015, a hụrụ mkpa ọ dị ihibe ngalaba National Peace Committee (NPC) n’afọ 2014, iji hụ na e nwere ntuliaka nwere udo na ntụkwasị obi na Naijiria.

Ngalaba a, nke Abdulsalami Abubakar, onye bụburu onye isi ala Naijiria, nọ n’isi ya, emeela ọtụtụ mbịanye aka udo maka ndị na-azọ ọkwa n’ógó steeti na nke ọchịchị etiti.

N’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Septemba, ndị bi na Edo steeti ga-atụ vootu ha iji họrọ onye ndu ha.

K’osiladị, e nwere nchegbu gbasara udo na nchekwa nke ndị na-atụ votuu, n’ihi ọ̀jụ́jụ́ òtù Peoples Democratic Party (PDP) jụrụ ịbanye na nkwekọrịta udo na steeti ahụ.

PDP kwuru na mkpebi ha sitere na enweghị ntụkwasị obi n’ebe ndị uwe ojii nọ.

Godwin Obaseki, onye gọvanọ nke Edo, kwuputara na ndị uwe ojii na-akwado parti All Progressives Congress (APC), nke ọ sịrị na ọ pụtara ihe mgbe a kpochiri mmadu iri nke PDP, ndị o kwuru na-akpọchiri na-enweghị ihe ọbụla ha mere.

Na nzaghachi n’ọjụjụ PDP ịbanye na nkwekọrịta udo na ntuliaka nke Edo, Kukah kwuru na ọ bụghị oge mbụ onye na-azọ ndọrọndọrọ ọchịchị na Naijiria ga-ajụ ịbanye na nkwekọrịta udo.

ÍNYÒCHÀ ÓKWÚ À

TheCable nyochara ozi nkwekọrịta udo NPC nke afọ 2023, ma chọpụta na e nwere nkwekọrịta udo abụọ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị etiti, n’ihi nsonaazụ mwakpo n’ike pụtara ihe na ntuliaka gara-aga na Naijiria.

Nkwekọrịta nke mbụ bụ maka ịkwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị na-azo ọkwa ọchịchị n’okpuru partị ha dị iche iche, ịkwado ebumnuche ha n’atụmatụ mgbasa ozi nke partị ha, kama ịgbasa ozi na okwu ịkpa ókè. Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị niile nke afọ ahụ banyere na nkwekọrịta ahụ n’ụbọchị iri abụọ n’itoolu nke ọnwa Septemba nke afọ 2022.

Ndị na-azọ okwa onye isi ala n’afọ 2023 gbakọrọ na International Conference Centre dị na Abuja iji banye na nkwekọrịta udo maka ịnwe ntuliaka aka n’enweghị nrụrụ áká ọbụla.

Peter Obi, onye ji Labour Party (LP) azọ ọkwa onyeisi ala; Atiku Abubakar, nke PDP; Rabiu Kwankwaso, nke New Nigeria Peoples Party (NNPP); na Omoyele Sowore, nke African Action Congress (AAC) nọ na mmemme ahụ, ma Tinubu, onye e kwuru na ọ nọ n’obodo United Kingdom, abịaghị nya bụ mbianye aka.

Mana Kashim Shettima, osote ya, nọchiritere anya ya n’ụbọchị ahụ.

Ụfọdụ mgbasa ozi ndị ọzọ kwuputakwara mbianye aka udo mbụ a n’afo 2022, dịka a hụrụ ebe a, ebe a na ebe a.

Nkwekọrịta nke abụọ, nke a banyere n’ubochi iri abụọ n’atọ nke ọnwa Febrụwarị nke afọ 2023, bụ maka ndị na-azọ ọkwa onye isi ala ịkweta ịnabata nsonaazu nke ntuliaka ahụ.

Tinubu nọ na ịdebanye aha nke nkwekọrịta nke abụọ.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Site n’ihe aka ebe anyị nwetagasịrị, okwu Kukah na Tinubu abịanyeghị aka na nkwekọrịta udo nke ntuliaka afọ 2023 abụghị eziokwu.

Source link

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *